Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ọkụ si gbarie ụlọikpe Majie dị n’Ebonyi, laa ọtụtụ ihe n’iyi

0 432

Ọkụ agbariela ụlọikpe ‘magistrate’ dị n’Ebonyi Steeti ma lakwaa ngwa ụlọ ọnụego ya ruru nde kwuru nde naịra n’iyi.

Onye ji ọkwa ‘Chief Registrar’ n’ụlọikpe ahụ bụ oriaku Onuoha gwara onye ntaakụkọ anyị na ọkụ ahụ malitere n’ebe elekere iri na abụọ maọbụ elekere mbụ nke isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde, ụbọchị abụọ nke ọnwa June 2023.

“Dịka ị na-ahụ ebe, ọkụ a lara ọtụtụ ihe anyị ji arụ ọrụ n’iyi, ihe karịrị nde naịr 40 lara n’iyi n’ọkụ a,” Oriaku Onuoha kwuru.

“Naanị ebe na-agabghị ọkụ bụ ebe a na-akpọ ‘rgistry’ n’ihi na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ gbatara n’oge iji menyụọ ya bụ ọkụ.”

Ọ kọwara na a na-eche na ọ bụ igwe na-enye ọkụ a na-akpọ ‘transformer’ na bekee, nke dị nso n’ụlọikpe ahụ, kpatara ọkụ a.

Onweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n’ihe mberede a.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *