Take a fresh look at your lifestyle.

Anyị ga-emechi ụlọakwụkwọ, ụlọahịa ọbụla rubere isi n’iwu ‘sit-at-home’ – Peter Mbah

0 292

Gọọmentị Enugwu Steeti etiela iwu ọhụrụ na ha ga-emechi ụlọakwụkwọ na ụlọahịa ọbụla rubere isi n’iwu ‘sit-at-home’ n’ụbọchị Mọnde na-abịanụ.

Gọvanọ Enugwu bụ Peter Mbah tiri iwu a n’akwụkwọ ozi o kesara n’ụbọchị Satọde, ma gwa ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla ịpụta gaa ebe dị ha mkpa n’ụbọchị Mọnde, maka na gọọmentị etinyela atụmatụ nchekwa zuru oke n’ebe dị icheiche.

Akwụkwọ ozi ahụ gọvanọ binyere aka na ya kwuru sị: “Nke a bụ iji gwa ụlọakwụkwọ, ahịa, ụlọahịa, ụlọọgwụ, ndị ọkwọ ụgbọala, na ọha obodo niile, ka ha cheta na gọọmentị amachiela ma kagbuo ọnọdụ ‘sit-at-home na mpaghara niile n’Enugwu steeti.”

“Gọọmentị na-adọ mmadụ niile aka na ntị ka ha rube isi na mmachi a. Ndị ọrụ gọọmentị ga na-akpagharị iji hụ na ndị mmadụ rubere isi n’iwu ọhụrụ a. Ụlọahịa ọbụla, ọdọ ụgbọala ọbụla, ụlọọrụ ọbụla, maọbụ ụlọakwụkwọ ọbụla nupuru isi ma kpọchie ogige ha n’ụbọchị Mọnde, gọọmentị nwereike imechi ogige ahụ kpamkpam.”

Ọnọdụ ‘sit-at-home’ bụ iwu ndị otu ‘Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile, kamgbe ọnwa Ọgọst afọ 2021, iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jide onyeisi ha bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n’ike na Naịjirịa.

Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ọtụtụ ndị ekperima malitere ịgagharị na mpaghara dị icheiche, na-awakpo ndị mmadụ, na-agba ụgbọala ọkụ, ma na-egbukwa ụfọdụ ndị mmadụ bụ ndị pụtara ịga ahịa maọbụ ọrụ n’ụbọchị Mọnde.

Kamgbe ahụ, ụbọchị Mọnde bụzi ụbọchị ezumike na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ maka na ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụta iro.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *