Take a fresh look at your lifestyle.

Hajj 2023: Kwara steeti bugoro otutu ndị njem ala nsọ na Saudi Arabia

0 583

Ndị otu ndị Alakụba na-ahụ maka ọdịmma ndị pilgrim na Kwara steeti kwuru na ebulala ndị njem ala nsọ steeti ahụ otu puku, narị ise na iri itoolu na asatọ (1,598) na Saudi Arabia maka mmemme Hajj nke afọ a.

Na mkparịtaụka ya na onye nta akụkọ Voice of Nigeria, onye ode akwụkwọ nchịkwa nke ụlọ ọrụ ahụ, Alhaji Abdulkadir Abdulsalam nyere nkọwa nke ọnụ ọgụgụ a ruo ugbu a.

Nhụsianya a gosiri na e bugoro ndị njem ala nsọ narị abụọ na iri isii na abụọ n’abali iri abuo na isii na iri abuo na asaa nke ọnwa Mee.

N’abalị iri abụọ na asaa na iri abụọ na asatọ nke ọnwa Mee, e bugorokwa ndị njem narị abụọ na iri asaa na abụọ n’ụgbọelu ebe n’abalị iri abụọ na asatọ na iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee, 2023, e bufere ndị njem ala ala narị abụọ na iri isii na itoolu si steeti ahụ gaa Alaeze Saudi Arabia maka mmemme Hajj nke afọ 2023.

N’otu aka ahụ, n’abali iri ato na iri ato na otu nke ọnwa Mee, e bugoro narị abụọ na iri asaa n’ime ha n’ụgbọelu ebe ndị ọzọ nwere oge ha n’etiti abalị mbụ na nke abụọ nke ọnwa Juun.

Dị ka ya si kwuo, e bugara ndị njem ala nsọ nari abuo iri asaa ọzọ n’abalị Tọzdee na Lagos na-aga Madinah site na Air Peace iji mejupụta ọnụ ọgụgụ dị ugbu a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *