Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ‘fuel subsidy’ mmanụ ụgbọala

0 329

Gọọmentị etiti na otu jikọtara ndị ọrụ Bekee bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ taa ma ọ kụọ elekere abụọ nke ehihie maka mwepu a ga-akwụ maka mbubata mmanụ agbidi.

Onyeisi otu a bụ Joe Ajaero kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị mgbasaozi Channels TV nwere.

“Ọ dịka gọomenti o gosila mmasị n’ịkparịtaụka. Ha kpọtụụrụ anyị n’abalị anyị enwee nkwekọrịta izuta n’elekere abụọ nke ehihie taa (Wenezde).

“A ga-eleba anya n’ọtụtụ ihe, ị gaghị ewepu ‘subsidy’ ebe ị naghị arụpụta mmanụ, e nweghi ihe i hiwere iji chekwaa ọnụahịa ihe nwereike ịda n’ahịa, onye na-erebu ihe N10 ga-achọ irewezi ya N100.

O kwuru na ebumnobi Onyeisiala Tinubu dị mma kama a ga-achọ usoro ọzọ a ga-eji mee ya.

Onyeisiala Buhari kwesiri ịjụ ajụjụ ọfụma ma chọpụta etu ọ ga-esi emetụta ndị mmadụ tupu o wepu ya bụ ‘subsidy’.

Ajaero kwuru na ihe gọọmentị kwesịrị ime gụnyere; ịrụzi ọdọ ebe a na-esi mmanụ agbidi na Naịjirịa, ịrọpụta ọtụtụ ụzọ ọzọ ndị mmadụ ga-esi na-eme njem.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *