Take a fresh look at your lifestyle.

Ọchịchị Tinubu Chọrọ Ekpere Ka Ọ Gaa Nke Ọma – Gọvanọ Steeti Lagos.

Nnenna Okoro dere ya na bekee.

0 235

Gọvanọ Legọs steeti bụ Maazị Babajide Sanwo-Olu akpọkuola ndị niile chọrọ ịga njem Hajj afọ a site na steeti ahụ ka ha kpee ekpere maka obodo ịga nke ọma maka  ọchịchị ọhụrụ.

Gọvanọ ahụ nyere ihe ngosi a mgbe ọ na-ekwu okwu na Semina nke Òtù Na-ahụ Maka Ndị Alakụba na steeti ya  haziri iji mee ka ndị njem na-eche echiche banyere ihe nke mmụọ.

Gọvanọ Sanwo-Olu onye nọchitere anya ya bụ osote ya, Dọkịnta Kadri Hamzat kọwara na obodo ahụ chọsiri ekpere ike ka ọ na-agafe ọchịchị ọzọ.

O kwuru na ihe obodo chọrọ ugbu a bụ ekpere ga-enyere ọchịchị Bola Tinubu na Gọvanọ ndị ọzọ aka ime nke ọma.

N’ikwu okwu na seminarị Gọvanọ ahụ kwusiri ike na ndị  na -aga njem a ga-agbaso nkuzi nke Islam ma rube isi n’iwu nke Alaeze Saudi Arabia

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *