Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Sanwo-Olu gwara ndị omebe iwu-ndị a họpụtara ahọpụta ka ha bute mmasị ụmụ amaala ụzọ.

NNENNA OKORO DERE YA NABEKEE.

0 190

Gọvanọ Sanwo-Olu gwara ndị omebe iwu-ndị a họpụtara ahọpụta ka ha bute mmasị ụmụ amaala ụzọ.

Gọvanọ Steeti Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu agwala ndị omebe iwu obodo ahụ a họpụtara ka ha bute ọdịmma ụmụ amaala ụzọ.
Sanwo-Olu nyere ndụmọdụ a na Lagos House, Marina, mgbe ọ nabatara onye na-achọ izọ onye isi oche nke Ụlọ Nnọchiteanya, Mr Tajudeen Abass, na ndị otu ya .
O kwuru na ndị nnọchiteanya Reps bụ ndị a họpụtara n’ọchịchị na-abata nke National Assembly (NASS) nke iri kwesịrị igosipụta omume ọma ụdị dị iche iche nke obodo ahụ.
Gọvanọ ahụ kwuru na asọmpi a na-azọ ọkwa isi ụlọ omeiwu na-abụkarị asọmpi kpụ ọkụ n’ọnụ nke ga-emegide ndị otu na ibe ha.
Dị ka ya si kwuo, ebumnobi maka ịzọ ọkwa oche n’ụlọ omebe iwu kwesịrị igosipụta ọdịmma na ọchịchọ nke ndị mmadụ.
Otu pati All Progressives Congress (APC) na-achị nwere ọtụtụ ndị a họpụtara na ụlọ ọgbakọ omebe iwu mba abụọ ahụ ma na-atụ anya iguzobe onye isi na-esote ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *