Take a fresh look at your lifestyle.

Amalitela ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala nke 2023

0 337

Amalite ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere n’abalim iri abụọ na ise nke onwa Febrụwarị afọ a, bụkwa nke a kpọpụtara Bola Ahmed Tinubu, nke pati All Progressives Congress (APC) dịka onye meriri ya.

Dịka ndị APC si kwuo, ikpe nke bụ nke bekee na-akpọ ‘pre-hearing’; nke a pụtara na ọ bụ ebe a ka a ga-anọ kpebie ụfọdụ ihe tupu a malite ya bụ ikpe kpọmkwem.

Ngalaba haziri ntuliaka a bụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) kwuru na Tinubu nwetara vootu dị 8,794,726 iji turu ugo ma bụrụ onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa, ebe Atiku nwetara vootu 6,984,520; Peter Obi nwetara vootu 6,101,533.

Kedu ndị mere mkpesa a n’ụlọikpe?

Dịka Inec kpọpụtara Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa ma nyekwa ya asambodo mmeri, Atiku, Obi, nakwa mmadụ abụọ ọzọ – Solomon Okangbuan nke pati Action Alliance (AA), Nnadi Charles Osita nke ‘Action Peoples Party (APP), na Chichi Ojei nke pati Allied Peoples Movement (APM) – kwuru na ha ekwenyeghị na mkpọpụta ahụ Inec mere.

Ha ise wegara akwụkwọ mkpesa n’ụlọikpe iji gbaghaa mpụtara ntuliaka ahụ Ine kpọrọ.

Atiku kwuru na Inec agbasoghi usoro iwu ntuliaka na nhazi ntuliaka ahụ, ya mere ha chọrọ ka ụlọikpe nye iwu ka a napụ Tinubu asambodo mmeri Inec nyere ya.

O bokwara ebubo na Tinubu etozughị iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’ihi ebubo ibu ọgwụike bụ nke e boro ya na mba US ọtụt afọ gara aga.

Atiku chọrọ ka ụlọikpe kpọpụta aha ya dịka onye meriri ntuliaka ahụ, ebe ọ bụ na ọ bụ ya gbara onye nke abụọ.

N’aka nke ọzọ, Peter chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ntuliaka ahụ kpamkpam ka Inec hazigharịa ntuliaka ọzọ, bụ nke Rinubu na ndị APC agaghị eso zọọ.

Obi kwukwara na Tinubu enwetazughị vootu zuru oke n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja dịka iwu Naịjirịa si kwuo.

Solomon Okangbuan nke pati AA na-arịọ ụlọikpe ka ha kagbuo ntuliaka ahụ n’ihi na Inec nupuru isi na mkpebi ụlọikpe ma wepụ aha ya na ndị ga-eso zọọ ya bụ ọkwa.

Na mkpesa nke ya, Nnadi Osita nka APP boro ebubo na Tinubu nyere ndịọrụ Inec ego akazụ ka ha wee mee nrụrụaka na ngụkọ mpụtara ntuliaka na steeti nakwa okpuru ọchịchị dị icheiche.

Osita bokwara ebubo na Tinubu na APC nyere ọtụtụ ndị bịara ịtụ vootu ego iji zụrụ vootu ha, ma kwukwaa na ndị na-ekweghị ịnara ego ahụ, e gbochiri ha ịtụ vootu.

Chichi Ojei, bụ naanị nwaanyị so zọọ ọkwa ahụ chọrọ ka ụlọikpe napụta Tinubu asambodo mmeri nke Inec nyere ya maka na o tozughi ịzọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa dịka iwu Naịjirịa nakwa iwu ntuliaka si nye ntuziaka.

Ole mgbe a ga-ekpebi ikpe a?

Dịka iwu si dị, a na-atụ anya na mpụtara ụlọikpe a ga-apụta ma ọ gachaa ụbọchị otu nari na iri asato e ji wetara ha mkpesa.

Mana ebe ọ bụ na ọ bụghị n’otu ụbọchị ka mmadụ anọ a wegara mkpesa ha n’ụlọikpe, mkpebi ụlọikpe gbasara mkpesa anọ a nwereike ịpụta icheiche.

Mana ọ bụghị n’ụlọikpe mkpegharị ka ya bụ ikpe ga-ebi. Ohere dị maka iwega ya n’ụlọikpe kachasị, bụ ebe e kwesịrị ileba ya anya ma nye mkpebi n’ime ụbọchị iri isii.

Nke a pụtara na njem ụlọikpe a nwereike ịkụrụ ọnụ n’ime ọnwa asatọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *