Take a fresh look at your lifestyle.

Sudan adila njikere ime ngaghari iwe n’abali isii nke Apri

0 651

Ndi Sudan nke chọrọ ọchichi onyekwucheya adila njikere ime ngaghari iwe n’abali isii nke ọnwa Epril nke ugboro atọ bụ nka aga eme n’ihu isi ụlọ ọrụ ndi agha dina Khartoum,onye ndu ha bụ onye jibu ọkwa onyisiala bụ,Prezidenti Omar al-Bashir achituru.

Ebe ndi ji ọchichi na agba mbọ igbochi ọtụtụ mmadu ime ngaghari iwe n’igwe.

Isi ụlọọrụ ndi agha bụ nke agbara ogige di ntu mita ise n’ogologo ma nwe akwa abụọ site na Blue Nile bu nke emechiri.

Ọtụtụ akwa mmiri ndi ọzọ ka ana ele anya imechi n’ụbọchi ahụ.Ndia na eme ngaghari iwe kwuru na gaghi enwe usoro nzirikọta ozi ụbọchi ahụ.

Na ihi nkea,ka ndi ọchichi kwuru na agaghi eje akwụkwọ n’ụbọchi Wednesde, iji mee ka ụmụ n’etoeto ghara iso mee ngaghari iwu a.

Ndi nta akụkọ kwuru na enyere ndi Central Reserve Force, CSF, bụ ndi amara dika Abu Tayra, onyinyi ego iji gbochie ngaghari iwe a.Ana atụ anya ndi CSF ọnụ ọgụgụ ha di puku iri abụọ maka nkea.

Kamgbe ọnwa Ọktọba ndi agha were ọchichi na ike,ihe kariri mmadu iri itolu anwụọla ebe mmadu puku anọ bụ ndi meruru ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *