Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ ogogo asaa dara na Banana Island, Legọs

0 328

Ụlọ ogoogo asaa dara na mpaghara Banana Island nke dị na Legọs steeti n’ụbọchị Wenezde.

Ngalaba gbatagbata nke Legọs steeti bụ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) na-ekwu na ọ bụ dịka gwongworo gbabara n’ime ya bụ ụlọ butere ọdịda ya.

LASEMA kwukwara na e nweghị ndị nwụrụ na ya bụ ụlọ dara nụ.

Kama ha kwuru na mmadụ asaa merụrụ ahụ ma sị na ụfọdụ na-anata ọgwụgwọ ebe ụfọdụ n’ime ha alaala ụlọ ha.

Ha kwuru na e nwere otu onye ọzọ aha ya so na ndị baịara ọrụ ebe ahụ kama ha amaghị ma ọ pụrụ apụ ka ọ tọrọ n’ime ụlọ ahụ dara nụ

Dika o siri dị ugbua, LASEMA kwuru na ha na-agba mbọ iji hụ na ya bụ ụlọ ebuteghị ihe mberede ọzọ ma sịkwa na ha etinyela igwe eji achọpụta ma e nwere onye ka tọrọ n’ime ụlọ ahụ.

Cheta kwa na e nwere ihe onyonyo nke nọ na soshial midia nke gosiri ebe otu onye setere mgbe ụlọ a na-ada.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *