Take a fresh look at your lifestyle.

Kansul na-ekesa ngwa ahịa Agro-chemical, nye ndị ọrụ ugbo Abuja.

foluke ibitome dere ya na bekee.

0 415

 

Kansul na-ekesa ngwaahịa Agro-chemical, nye ndị ọrụ ugbo Abuja.

N’ịmalite oge ọrụ ugbo nke afọ 2023, Abuja Municipal Area Council (AMAC), kesara ngwaahịa agro-chemical nye ndị ọrụ ugbo 120 ahọpụtara n’ofe ngalaba ndọrọ ndọrọ ọchịchị iri na abụọ dị na kansụl mpaghara ahụ.

Onye isi oche AMAC, Christopher Maikalangu, nyere onyinye a n’oge mmeghe nke oge ugbo 2023 nke akpọrọ “Mgbanwe ọrụ ugbo”.

Akụkọ gbakọtara na ndị ọrụ ugbo iri, onye ọ bụla sitere na ngalaba iri na abụọ dị na mpaghara ahụ, ji akpa igwe na-efesa, ọgwụ ahịhịa dị iche iche na ihe ndị ọzọ na-arụ ọrụ ugbo laa.

Ọzọkwa, ndị ọrụ abụọ na-ahụ maka ịgbatị ọrụ ugbo ji ọgba tum tum ọhụrụ nke ọ bụla mụmụọ ọnụ ọchị n’ụlọ iji nyere aka na-eme njem ha na nkesa ngwaahịa ugbo n’obodo ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *