Onyeisiala bu,Muhammadu Buhari nọrọ n’ụbọchi Tuuzde nabata mkpesa banyere ihe mberede nke ụgbọ-oloko site n’aka ndi Service Chiefs,nke onye ndu ha bụ onye Chief of Defence Staff, General Lucky Irabor.
Ndi Service Chief, bụ ndi jere ebe odachia nọọ mee na Kaduna,rutere ogige onyeisiala bụ Presidential Villa ka ọkụrụ 14:55 GMT.
Ha kọwari onyeisiala ka ya bụ ọdachi siri mee n’abali ụbọchi Mọnde na Kaduna.
Mgbe ha n’aga ndi nta akụkọ okwu ka ha nwechara ọgbakọ ha na onyeisiala,onye the Chief of Defence Staff, General Irabor kwuru:
“Anyi bara ikọwara onyeisiala banyere ọdachi a,bụ nke ndi omekome tinyere mgbọ ogbun’igwe na okporo ụgbọ-oloko,bụ nke tara isi ọtụtụ ụmụafọ ala Naijiria,ebe mmadu iri abụọ na itolu meruru ahụ ma tọrọkwa ụfọdu mmadu.
“ya mere anyi ji jee ebe ahụ na ututu a ,jee hu ka ya bụ ihe siri mee ma bi aka anyi kowara onyeisiala ihe mere.”
Onye Defence Chief kwuru na ndi ọrụ nchekwa ga eji ọdachia muta ihe site na itinye uchu n’ọrụ.ma gwa ndi ala Naijiria na ndi agha nakwa ndi ọrụ nchekwa ga agba mbọ hụ na enwere ezi nchekwa.
Leave a Reply