Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii egbochiela ụmụ nwaanyị na-eme ngagharịiwe maka ogbugbu otu onye n’Ebonyi Steeti.

0 283

Ụmụ nwaanyị egbochiela ndị mmadụ ígafe n’okporoụzọ díka ha mere ngagharịiwe maka ogbugbu ha sị ndị ọchi ehi gburu otu onye n’obodo Ishiagu nke dị n’okpuru ọchịchị Ivo nke dị n’Ebonyio steeti.

Ọnụ na-akwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovewakpoyeya kwuru na ya bụ ngaghariiwe mere dịka ha nwetara mkpesa maka ya ma sịkwa na ndị uweojii gbochiri ha.

O kwuru na ụmụ nwaanyị a ji ụkwụ ụgbọala ha mụnyere ọkụ na ihe ndị ọzọ mechie okporoụzọ eji eme njem dịka ha mebi kwara ụfọdụ ụgbọala.

O kwukwara na ụmụ nwaanyị a kwadoro ịme ya bụ ngharịiwe ụbọchị asaa maka ogbugbu e kwuru ndị ọchie ehi na-egbu ndị mmadụ na mpaghara ha.

Onovewakpoyeya kwuru sị, ” ụmụ nwaanyị dịka ha mechichara okporoụzọ, gara na nke Eze obodo ha, gaa nke kọmịshọna mgbasaozi, ma mebie ụgbọala, okoko osisi na ihe ndị ọzọ. Ndị uweojii pụrụ iche gbochiri ha ịgba ụlo ndị nọ ebe ahụ ọkụ”.

Onovewakpoyeya kwukwara na ha ma ndị haziri ya bụ ntuliaka ma sị na akpọola ha ka ha na ndị uweojii nwee mkparịta ụka.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *