Take a fresh look at your lifestyle.

Chimaroke ekeleela Kevin Chukwu, feere PDP aka

0 392

Onye bụbu Gọvanọ Enugwu Steeti ekeleela Mazi Kevin Chukwu maka mmeri o nwetara na ntuliaka oche sineti mpaghara Enugwu East.

Chimaroke onye sokwa zọọ ya bụ ọkwa zigara ozi ekele a n’ozi o tinyere n’akara Twitter ya.

“Ana m ekpere ka oge ọ ga-anọ n’ụlọ omeiwu ukwu gaziere ya,” Nnamani dere.

Ọ gakwra n’ihu rịọ ndị nkwado ya, bụndị ọ na-akpọ “Ebe anọ family”, ka ha nabata mpụtara ntuliaka ahụ.

Nnamani mechara wepụta akwụkwọ ozi ma kwuo na ya apụọla na PDP.

Ọ sị na ihe kpatara ya ji abụ bụ maka nghọtahie dị n’etiti ya na ndị isi PDP bụ nke enwghị mmekwata.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *