Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuli aka izugbe: Nchịkọta rịzọlt ga-amalite na Kwara State

0 335

Nchịkọta nke nsonaazụ ntuli aka izugbe nke Satọde gara aga ga-amalite n’elekere iri nke ụtụtụ Sunday,abali iri abuo na isii onwa Febuwari n’isi ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) dị na Ilorin, isi obodo Kwara Steeti, mpaghara North Central Naijiria.                                                Na nkwupụta sitere n’aka Kọmishọna Resident Electoral Commissioner na steeti ahụ, Garba Madami kwuru na nchịkọta ntuli aka nke Kwara Central Senatorial District ga-eme na steeti INEC Collation Center dị na Ilorin ebe nke Kwara North Senatorial District ga-enwe n’isi ụlọ ọrụ Bode Saadu nke ọchịchị ime obodo Moro na. nke Kwara South Senatorial District ga-eme na Omu Aran na Irepodun local government.                                                   Dịka Madami siri kwuo, ọ bụ naanị ndị nnọchi anya otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ nchekwa, ndị mgbasa ozi na ndị na-ekiri ntuli aka ka a ga-ahapụ ịbanye n’ime mkpokọta.                                                                                                                                                                                                                                 Emere ntuli aka onye isi ala na nke mba Satọde n’udo na steeti ahụ.                                                                                                                                              Kwara Steeti nwere mpaghara senatorial atọ nwere ọchịchị ime obodo iri na isii na ngalaba otu narị na iri itoolu na atọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *