Take a fresh look at your lifestyle.

Ministry njem etinyela ezi nchekwa na uzo ugbo oloko si Abuja eje Kaduna

0 458

Onye Minista n’ahu maka njem bu, Mazi. Mua’zu Sambo kwuru na enwela ezi nchekwa iji malite njem ugbo oloko si Abuja eje Kaduna.

Minista mere ka amata nkea mgbe o jere ileta ka oru si aga na okporo uzo ugbo oloko si Abuja jee Kaduna,ma meek a amata na enwela ezi nchekwa iji malite oru njem.

”Anyi emela otutu ihe ihu na enwere ezi nchekwa maka njem ugbo oloko si Abuja eje Kaduna,nke foduru ga adi ire n’ime abalilole na ole na abia tupu amalite ime njem ugbo oloko.

” Nkea malitere na igbata akwukwo ikikere tiketi eji eme njem,nke bu nani ndi nwere akara NIN nakwa National Identity Card bun di tozuru oke iji hu na enwere ezi nchekwa,” ka Sambo kwuru.

Dika onye Minista mere ka amata na otutu ihe banyere nchekwa bu nke agaghi eme ka ohaneze mata.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *