Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere Soludo jiri họpụta Ezekwesili na ndị ọzọ

0 563

Charles Chukwuma Soludo ahọpụtala Oby Ezekwesili na ndị ọzọ dịka kọmitii ga-enyefe ya ọchịchị a kpọrọ ‘transition committee’ n’ọkwa ịbụ gọvanọ Anambra steeti.

N’ozi Soludo wepụtara, Oby Ezekwesili ga-arụ ọrụ dịka onyeisioche kọmitii ahụ bụ ndị ga-ahụ na o were ọchịchị n’Anambra Steeti n’ọnwa Maachị afọ 2022.

Otu n’ime ndị ọ họpụtara bụ Lawrence Mefor gwara ndi nta akuko Igbo ka obi dị ya nakwa ihe mere Soludo jiri họpụta ha.

Mefọr sị na nhọpụta ya na ndị ọzọ bụ ihe ziri ezi maka na o nweghi onye Soludo ga-akpọ oku ka ọ ghara ịza.

Ọ sị na ihe mere e ji họpụta ndị maara nke ekwe na-akụ na ngalaba dị iche iche bụ maka na ịhazi ọchịchị adịghị mfe.

Mefor sị na ha ga-eleba anya na ngalaba dịka akụnaụba, agụmaakwụkwọ, ahụike, azụmaahịa, ụmụnwaanyị, ndị ntoroọbịa dgz ma bunye Soludo uche ihe o nwereike ime ka ọchịchị ya mee ọfụma.

Gịnị ka ‘transition committee’ pụtara na ọrụ ha.

Lawrence Mefor sị na ‘transition’ pụtara ngafe site n’otu ebe banye n’ebe ọzọ, ya bụ “isi n’ọchịchị gafe n’ọchịchị ọzọ”.

ọ sị na ọrụ komitii a bụ ịhụ na ọchịchị nke ochie kọwaara ọchịchị nke ọ hụrụ ka ihe si kwụrụ iji nyere ha aka ịmalite ọrụ na-egbughi oge.

Mefor sị ma emeghi etu ahụ na ọ ga-enye ọchịchị ọhụrụ nsogbu ịmata ọrụ na ha agaghị ka ha ga-esi malite ọrụ ha.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ihe ọzọ komitii a na-eme bụ ibunye uche maọbụ ịtụ arọ ka ọchịchị ọhụrụ ga-esi malite ọrụ.

Na ọ dịziri gọvanọ maọbụ onyeisi ọchịchị n’aka ịṅa komitii a ntị ịgba arọ ha tụnyeere.

Soludo ga-eburu oche ọchịchị n’ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị afọ 2022 site n’aka Willie Obiano chịrịla Anambra afọ asatọ.

Kọmitii a ga-amalite ọrụ ha n’ụbọchị iri na itoolu ruo ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Jenuwarị afọ 2022.

Ndị so na kọmitii a gụnyere:

1) Mrs Oby Ezekwesili (Chairperson)

2) Prof. Benedict Okey Oramah

3) Rt. Hon. Uche Okafor

4) Prof. Pat Utomi

5) Prof. Chidi Odinkalu

6) Mr. Steve Nworga

7) Chief Osita Chidoka

8) Hon (Dr) Ben Nwankwo

9) Hon Charles Odedo

10) Barr Tony Ifeanya

11) Mr. Ferdinand Agu

12) Prof. Osita Ogbu

13) Chief Chikwe Udensi

14) Dr. Greg Ibe

15) Dr. Alex Otti

16) Mr. Coleman Uba

17) Chief Collins Chikeluba

18) Engr (Sir) Chris Okoye              

19) Prof. (Mrs) Uche Amazigo

20) Barrister Pat. Ikwueto, SAN

21) Dr. Olisa Agbakoba, SAN

22) Barrister Echezona Etiaba, SAN

23) Prof. Offornze Amucheazi, SAN

24) Engr. Emeka Ezeh

25) Chief Leon C. Mezue

26) Hon Chike Anyaonu

27) Hon Evarist Uba

28) Dr. P.C.J Adibe

29) Chief Akachukwu Nwankpo

30) Dr. Mefor Law

31) Dr. Alex Obiogbolu

32) Dr Godwin Owoh

33) Dr. Greg Ugochukwu Ezeilo

34) Mr. Epundu Emechebe

35) Mr. Christian Udechukwu

36) Chinyere Ossy Okoye, Esq

37) Chief Don Eze

38) Mr. Chijioke Uwaegbute — PWC

39) Mr. Franklin Edochie

40) Mr. Dozie Okpalaobieri

41) Ms Nkoli Anyaoku

42) Ms Uche Onwuamaegbu

43) Mr. Innocent Isichei

44) Mr. George Nwangwu

45) Mr. Ikechukwu Nweje

46) Dr. Innocent Okpanum

47) Arc Henry Arize

48) Dr. Will Fleury

49) Barrister Udu – Former Head of Service

50) Dr. Emma Ezenwaji

51) Prof. Phil Phil-Eze

52) Mr. Joe Anatune

53) Mr. Ike Chioke

54) Prof. Ifedioramma Eugene-Mary Nwana

55) Mr. Emma Onyilofor

56) Ms Prisca-Anne Nwangwu

57) Ms Chinwe Jane Okoli

58) Mrs Amaka Obi

59) Fred Chukwuemeka Agbata

60) Mr. Chinedu Nwoye

61) Dr. Nelson Omenugha

62) Prof. Nkechi Ikediugwu

63) Prof. Ike Uzochukwu

64) Dr. Emeka Okeke

65) Dr. Polycarp Emenike

66) Dr. Godwin Nnadozie

67) Engr. Ifeanyi Okeoma

68) Amb Uche Ajulu-Okeke

69) Chief Pat Ubajaka

70) Prof. Okey Ikeanyibe

71) Comrade Charles Onyeagba

72) Prof. Au Nnonyelu

73) Dr. Forster E. Ihejiofor

74) Mr. Odera Ozoka

75) Mr. ThankGod Ibeh

76) Prof. Sylvia Chika Ifemeje

77) Mr. Kanayo Nwafor

78) Comrade Churchill Okonkwo

79) Sir Damian Okolo

80) Dr. Chinedu Onyeizugbe

Chita na Chukwuma Soludo meriri dịka gọvanọ ọhụrụ Anambra steeti na ntuliaka e mere n’ụbọchị isii ọnwa Nọvemba 2021.

O ritere mmeri n’okpuruọchịchị iri na itoolu n’ime iri abụọ na otu nke steeti ahụ.

Soludo gbara afọ iri isii na otu ji ọkọlọtọ APGA zọọ ya bụ ọkwa nke o ji vootu 112,229 merie ogbo ya nke PDP bụ Valantine Ozigbo bụ onye nwetere vootu dị 53,807.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *