Take a fresh look at your lifestyle.

Ndi uweojii atọhapụla Felicia Ejezie

0 655

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na a tọhapụla Felicia Ukamaka Ejezie, bụ onye a ma ama dịka ‘Mama Biafra’.

Ndị uweojii nzuzo nwụchiburu Mama Biafra n’ụbọchị Wenezde abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2018, maka ebubo na ọ na-ere akwụkwọ mgbasaozi Indigenous People of Biafra (Ipob).

Ọkaiwu Ipob, Ifeanyi Ejiofor, bụ onye gbara ama na Mama Biafra enwerela onwe ya n’ozi o wepụtara n’akara Facebook ya n’ụbọchịụka.

Ọ sị ,”Oriakụ Ukamaka Ejezie (Mama Biafra) enwerela onye ya.

“O sila na nga ndị DSS pụta.”

Cheta na nsonso a, Ejiofor gbara ama oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n’Owere na ya na ndị ọkaiwu Ipob ndị ọzọ na-anyụkọ mammiri ọnụ ịhụ etu a ga-esi gbapụta ‘Mama Biafra’ na ndị otu Ipob ndị ọzọ ndị e jichigara na mkpọrọ dị iche iche na Naijiria.

Onye bụdị ‘Mama Biafra’ a na-ekwu?

Ezi aha ya bụ Felicia Ejezie mana a malitere ịkpọ ya ‘Mama Biafra’ n’ihi ihe nwaanyị ahụ karịala afọ 60 gabigara n’oge agha, ebe o wuwere ewu dịka ndị ọrụ nchekwa Naijiria nwuchiri ya n’afọ 2018 maka ire akwụkwọ a sị na-agbasa ozi Ipob.

Mama Biafra bụ onye Eziata Okpoto Umuisiobu nke Bende dị n’okpuru ọchịchị Bende n’Abia steeti.

Mama Biafra lụrụ dị onye Anambra steeti na nwata mgbe a lụrụ agha Biafra na 1963.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *