Ndị bi na mpaghara Kubwa nke nọ n’isi obodo Naijirịa bụ Abuja nọ n’uju dịka ụlọ ahịa nke dị n’Aso Savings dara.
Dịka o siri dị, naanị otu onye nwụrụla na ya bụ ọdachi ebe a ka na-achọ otu onye ọzọ achọ.
Mmadụ ise ọzọ bụ ndị eburula gawa ụloọgwụ.
Onye hụrụ ka ya bụ ihe mere kwuru na ọ bụ n’ihe dịka elekere iri na otu nke abali ka ya bụ ihe mere.
Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ iji nwa ọrụ adịgboroja ya na imegharị usoro esiri see ya bụ ụlọ butere ọdịda ya.
Dịka o siri dị, ndị ọrụ gbatagbata nke gụnyere ndị FRSC, NEMA na NSCDC auchiela ebe ahụ ma na-arụ ọrụ ha.
Leave a Reply