Aka n’achi Steeti Yobe bu,Mai Mala Buni anabatala osote onye ga-azọ ọkwa gọvanọ nke otu ndọrọndọrọ New Nigeria People’s Party bụ, Hon.Yahaya Gamajeji na PDP ex-officio na steeti ahụ, Alh. Sa’idu Sadauki Gashua n’ime otu All Progressives Congress (APC). Onye enyemaka Gọvanọ na mgbasa ozi bụ Mamman Mohammed mere ka a mara nke a na nkwupụta e wepụtara na Tọzdee. Mohammed kwuru na ndị ọhụrụ batara gosipụtara afọ ojuju n’ụdị ọchịchị Gọvanọ Buni na mbọ mmepe na steeti ahụ. Dị ka ya si kwuo, ndị abụọ a gbapụrụ agbapụ kwere nkwa ịrụ ọrụ maka ọchịchị APC na-edu na pati ahụ. Ka ọ dị ugbu a Gọvanọ Buni ekwela nkwa inyefe steeti ahụ na All Progressives Congress na ntuli aka izugbe nke 2023.
Leave a Reply