Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ndị ụka Katọlik anaghị anabata ndị mmadụ na-eme

0 442

E nwere ụfọdụ ihe ọtụtụ ndị mmadụ nabatarala dịka ihe ndị nwereike inyere ndụ aka, mana ọ bụghị ihe ndị ahụ niile ga-ekwe omume.

A bịa n’ihe ndị ahụ, ụfọdụ okpukperechi na-asọ ha nsọ, ọkachasị ụka Katọlik.

Na nso nso a, otu ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Joseph Obada, nke Achdayọsis Abuja, kwuputara etu ụka Katọlik si agbarụ ihu n’ụfọdụ usoro ọmụmụ nwa na-abụghị etu Chukwu si kee ya.

O kwuru na ụka Katọlika anaghị anabata mmadụ iburu onye ọzọ afọ ime nke Bekee kpọrọ ‘surrogacy’, ‘In vitro fertilization’ (IVF) nakwa usoro ndị ọzọ e si ebuso amụghị nwa agha.

Nke a kpalitere iwe ụfọdụ ndị mmadụ ebe ndị ọzọ na-ajụ ihe ndị ọzọ ụlọụka sọrọ nsọ na-abụghị naanị ndị metụtara ọmụmụ.

Ndi ntaakukọ kpọtụrụ otu ụkọchukwu Katọlik, Fr. Kelvin Ugwu, onye kọwara ụfọdụ ihe ndị ụka Katọlik na-asọ nsọ na ihe mere ha ji agbarụrụ ihe ndị a ihu.

Ihe ndị ụka Katọlik anaghị anabata

  • Ịmụ nwa n’ụzọ na-abụghị gị buru n’afọ nke gị (surrogacy): ụka Katọlik anaghị anabata nke a
  • Usoro IVF
  • Ite ime
  • Usoro nhazi/nkwụsịtu ọmụmụ (family planning)
  • Ịgbọ ncha (masturbation)
  • Agaghị Mass ụbọchị ụka
  • Ikpe ọnwụ (death sentence): ụka Katọlik anabataghị nke a n’ihi na ha ekwenyeghi n’ogbugbu mmadụ. Nke a pụtara na a gaghị akpọli onye fada ka ọ bịa kaara onye a mara ikpe ọnwụ maasị ikpeazụ
  • Ịṅụbiga mmanya oke: ụka Katọlik anaghị agbarụ ihu na mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya, mana ebe ha nwere okwu bụ mmadụ ịṅụgide mmanya ọ baa ya n’anya ma gbuwe ya egbuwe
  • Mmadụ ịgbanwe ahụ ya: Ise ‘tattoo’ abụchaghị ihe ọjọọ n’ụlọụka Katọlik, mana ịgbanwe ahụ gị (dịka ịkwụnye ike, itinye ara, ịdọtị ntị karịa etu o kwesịrị) bụ ihe ụka Katọlik anabataghị
  • Ịgba alụkwaghịm: “onye banyere alụmdinanwunye n’ụzọ ziri ezi abanyechaala, ọ bụladị Poopu ga-ekewali ha,” ka Fada Ugwu kwuru.Di na nwunye nwere ike ise okwu ma gbasatu, ọkachasị ọ bụrụ na e nwere onye nọ na nsogbu ihe ize ndụ, mana n’anya ụka Katọlik, ha ka bụ di na nwunye, a na-atụ anya na ha ka kwesịrị imezi. Mana e nwere ihe dịka ‘annulment‘ nke bụ ikwu na ya bụ alụmdinanwunye emeghi eme maọlị.
  • Nkagbu alụmdinanwunye (Annulment): Nke a nwereike ime ma ọ bụrụ na e mezughi ihe niile e kwesịrị ime tupu di na nwunye ahụ abanye alụmdinanwunye. Ịma atụ, ọ bụrụ na otu n’ime ha ghọgburu onye nke ọzọ tupu ọ lụọ ya (ihe dị ka ịtụ asị na ị toruola afọ ole mmadụ kwesịrị ịdị tupu ọ lụọ di maọbụ nwunye), e mechaa chọpụta, a ga-emeli ya bụ annulment.
  • Irife afọ (gluttony): ụka Katọlik na-agbarụ ihu na mmadụ ịhụbiga nri n’anya oke
  • ‘Homosexuality’, ‘incest’: ụka Katọlik na-asọ nwoke idina nwoke nakwa nwaanyị idina nwaanyị ibe ya. Ha na-asọkwa nwanne na nwanne inwe mmekọ nke ịkwa iko

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *