Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ọka iwu Naijiria ahọpụtala onyeisi oche ọhụrụ.

Sailhu Ali dere ya na bekee.

0 762

Ndị ọka iwu Naijiria ahọpụtala onyeisi oche ọhụrụ.

Onye ọkaiwu ukwu nke Naijiria, SAN, Mazị Yakubu Maikyau, apụtala dịka onye isi oche ọhụrụ nke otu ndị ọka iwu Naijiria, NBA.

Maikyau, Onye isi ala nke iri atọ na otu, nwetara vootu 22,342 iji merie onye isi ya bụ Chief Joe Kyari Gadzama, SAN, onye nwetara vootu 10,842 n’ime mkpokọta 34, 564 e mere.

Onye na-azọ ọkwa atọ nke NBA bụ Maazị Taidi Gunu nwetara vootu 1,380.

Ndị ọrụ mba ndị ọzọ nke NBA bụ ndị siri na ntuliaka bidoro n’elekere iri na abụọ nke ụtụtụ Satọdee Julaị 16 ma mechaa n’elekere iri na abụọ nke abalị, bụ: Oriakụ Linda Bala dịka osote onye isi otu 1st, Mazị Clement Ugo dịka osote onye isi nke abụọ na Oriakụ Amanda Demechi-Asagba ka onye isi oche nke atọ.

Ndị ọzọ gụnyere Mazị Adesina Adegbite dịka odeakwụkwọ ukwu, Mazị Daniel Kip Ka-Ayli dịka onye enyemaka odeakwụkwọ ukwu, Oriakụ Chinyere Obasi dịka odeakwụkwọ ọdịmma mba, Mazị Habeeb Lawal dịka odeakwụkwọ mgbasa ozi nke mba, Mazị Olawole Ajiboye dị ka onye enyemaka mgbasa ozi na Anze. -Bishọp Ladidi ka onye na-echekwa ego.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *