Take a fresh look at your lifestyle.

IME NJEM GAA MBA OFESI N’ỤZỌ EKWESịGHị EKWESị N’IHE SOO YA.

0 764

Ime njem n’ụzọ ekwesịghị ekwesi bụ ihe jọgburu onwe ya.Ọ na-egbutere  ọtụtụ mmadụ ajọ aha,ntaramahụhụ na ihe ihere,makana onye ahụ mere njem di otu a na-emetọ aha ya na nke obodo ya.

Obodo ọ bụla nwere usoro onye mba ọzọ kwesiri iso tupu ọ bata na ya.

O nwere ọtụtụ ihe na-ebute ime njem n’ụzọ ezighi ezi.Ha bụ ihe ndi a:

1)Ihe isi ike :nke a bụ isi ahụrụ kwaba okpu na- ebute ụdị njem .

2)E nwetaghị akwụkwọ ikike eji eme njem n’ oge,sokwa n’isi sekpu nti n’ihe mere ụfọdụ ji eme njem na mba ofesi n’ụzọ ekwesịghị ekwesị.

3)Nghatọkọ usoro ọchịchị:Ọ bụrụ n’usoro ọchịchị adighi mma ,ụfọdụ ndi mmadụ ga-achọba ụzọ iji gbapụ n’obodo ha gaa mba ofesi,ka ha were gbanahụ  ajọ ọchịchị.

4)Ọ bụrụ na  ọnụ ego mba  ọ bụla ada kpụọ afọ n’ala, karia otu o kwesiri,nke bụ na ọ gaghịzị azụlite ihe n’ahia etu o kwesiri,ndị ụfọdụ ga-achọba ụzọ isi gbapụ, gaa mba ofesi ọ bụla  ebe ọnụ ego ha dị mma ma bakwaa uru.

5)Nghọgbu ụfọdụ ndị mmadụ na-aghọgbu  mmadu ibe ha ka ha were ha wee tuo mgbere ire mmadu n’igba ohu.

AKỤKỌ IHE MERE EME NKE NA-EGOSIPUTA IHE DI OTU A.

Na igba ajụjụ ọnụ nke otu onye nta akụkọ  bụ Amarachi Nwanguma n’ulọọrụ nta akụkọ VON(VOICE OF NIGERIA ) mere otu nwata nwoke  aha ya bu Obinna Abu nke ụdị ihe  a metụtara.

Obinna si Abu Agụ dị n’okpuru ọchịchị Nando nke Steeti Anambra, South-East Nigeria.

Obinna gụchara nzere na Classical Music na Nnamdi Azikiwe Federal University Awka, Steeti Anambra, n’afọ 2011.

Ka o mechara mmemme  iji otu afọ fee ala nna ya bụ National Youth Service Corps (NYSC) na bekee n’afọ 2013, ọ gara n’okporo ámá dị n’Abuja na-achọ ọrụ mana ọ hụghị nke ọ bụla.

Ọ zutere ịhụnanya ya bu Azuka Perpetua. Ha lụrụ otu afọ ọ mechara NYSC ma mụọ ụmụ abụọ ka afọ abụọ gachara.

Obinna nwekwuru nkụda mmụọ nweta ọrụ ka o wee nwee ike ịkwado ezinụlọ ya obere.

Ọ bụ mgbe ahụ ka o kpebiri ịchọ enyemaka site n’aka Emeka, nwa nwanne nne nke bi na-arụ ọrụ na Italy.

Emeka mechara ghọrịa ya ma gwaa ya na ọ dịghị mkpa iji akwukwo ikike kwesiri were banye EUROPE.

O gara n’iru kowara ya na ha ga-amiba na EUROPE na-ejighi akwukwo ikike.Obinna were kwere.

Mgbe Obinna jiri mata na egwu esigo n’etili ogwu banye n’usurugada bu egwu ndi mmuo bu mgbe o malitere njem a ya na nwunye ya bu Azuka were rutee Lybia bu ebe erere ha ere.

Azuka bu onye noro ebe ahu ma nata ntaram ahuhu puru iche ebe ha na-agba ohu dika ndi erere ere.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *