Take a fresh look at your lifestyle.

Ndịagha Amerịka ebunyela ndị otu ha ngwaagha n’Abuja

0 362

Mba Amerịka kwuru na ha ebunyela ndị na-agbakọrọ ha aka na Naịjirịa ngwaọgụ n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.

Nke a dị n’ozi ụlọọrụ US Africa Command (Africom) bipụtara n’akara X ha n’ụbọchị Tuzde 13 Jenụwarị 2026.

Ha kwuru na onyinye a bụ iji nyere Naịjirịa aka n’agha ha na-ebu megide ọnọdụ enweghị nchekwa.

Ha mekwara ka o doo anya na nke a bụ iji mejupụta ntụnyeoke ha na mgbakọaka gbasara nchekwa.

Ozi ahụ sịrị: “Ndịagha Amerịka ebunyela ndị na-agbakọrọ anyị aka na Naịjirịa ngwaagha n’Abuja”.

Onyinye a na-akwado ọrụ nchekwa na-aga n’ihu ugbua na Naịjirịa, ma na-arụtụ aka na mgbakọaka gbasara nchekwa n’etiti anyị.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *