Vitali Klitschko bụ Meyọ na-achị Kyiv kwuru na mba Ukren nwereike inye mba Rọshịa ala maka udo.
O kwuru nke a dịka Onyeisiala mba Amerịka na-amanye ha ka ha kweta nwere ala nye ndị Rọshịa ka udo dị.
“Otu n’ime ihe nwereike ime bụ na anyị ga-enwepụ aka n’ala anyị. Ọbụghị ihe ka mma. Mana maka udo, udo nchereoge, o nwereike ọ bụrụ ihe ga-enweta udo, mana ọ gaghị adịgịde”.
Vitali sị na “mba Yukren agaghị anabata ọnọdụ ga-eme ka Rọshịa bụrụ ndị na-achị ha dịka ndị a dọorọ n’agha”.
Ọ mere ka amata nke a na nwantiti oge mba Rọshịa tụchara ogbunigwe gburu mmadụ iri abụọ ma meruo ọtụtụ ndị mmadụ ruru 80 ahụ na mpaghara Kyiv.
Leave a Reply