Take a fresh look at your lifestyle.

Pa Reuben Fasoranti etoola Onye isi ala Bola Tinubu maka ihe ọ na-eme iji kwalite ndụ ndị Naijiria.

Chigo deziri ya n'Igbo.

0 34

Pa Reuben Fasoranti onye ndu  Afenifere  etoola Onye isi ala Bola Tinubu maka ihe ọ na-eme iji kwalite ndụ ndị Naijiria.
N’Akure Steeti Ondo ka Ọ na-ekwu okwu mgbe nwunye onyeisiala Naijiria, Oluremi Tinubu, gara leta ya ka mere afọ 98, n’ụlọ obibi ya dị.
O kpere ekpere ka Chineke gaa n’ihu na-eduzi onye isi ala.
Pa Fasoranti tokwara Nwanyị Mbụ mma maka nkwado ọ na-enye Onye isi ala site na Initiative Renewed Hope Initiative .
Nwunye Onyeisiala gosiputara ọṅụ ya na otu Nwamadi a ahụ si dị mma.
Oriakụ Tinubu zutekwara ihe karịrị ndị eze omenala iri isii na Steeti nke Deji nke Akure tinyekwara Oba Aladetoyinbo Ogunlade, bụ onye guzo maka onyeisi oche nke kansul, bụ Olowo nke Owo.

Nwunye onyeisiala nyefere ha ihe onyinye di iche iche.
Oriakụ Oluwaseun Aiyedatiwa bụ nwunye Gọvanọ steeti Ondo n’okwu nnabata ya, kelere nwunye  onyeisiala  maka ịbụ ezi nne karịsịa na ka ọ na-aga n’ihu na-eleba anya n’ọhụhụ ụmụ nwanyị, ndị ntorobịa na ụmụaka.
Dọkịta Lucky Aiyedatiwa Gọvanọ steeti Ondo   rụtụrụ aka n’ ihe dị iche iche Onyeisiala mere n’Akure.
N’okwu ya, Oriakụ Oluremi Tinubu toro ndị ọrụ ahụike .
Nwunye onyeisiala Naijiria nyere nwunye Gọvanọ, Oriakụ Oluwaseun Aiyedatiwa nde naira iri ise maka inye otu puku ndị inyom  ndị na-azụ obere azụmaahịa .

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *