Take a fresh look at your lifestyle.

A hụla ụkọchukwu US a tọọrọ n’ụlọ ụka mgbe ọ na-agbasa ọzịọma na Saụt Afrịka

0 118

A hụla ụkọchukwu Amerịka bụ Josh Sullivan a tọọrọ n’ụlọ ụka na Saụt Afrịka oge ọ na-agbasa ozi ọma n’izuụka garaaga.

A hụrụ Josh Sullivan na mpaghara Gqeberha dị na Cape town ka ndị ọrụ nchekwa na ndị ntọ kwakọtachara mgbọ bụ nke butere ọnwụ mmadụ atọ.

Ugbua enwebeghị ihe a maara banyere ndị ntọ ahụ, mana ụlọọrụ ndị uweojii na Saụt Afrịka a na-akpọ Hawks kwuru na “anyị nwetere ozi banyere ebe ndị ntọ ahụ kpọgara Josh Sullivan bụ nke mere anyị jiri gaa ebe ahụ. N’oge anyị ruru ebe ahụ ka ndị ntọ gbawara ọsọ ma na-agba ndị otu anyị egbe”.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Hawks bụ Avele Fumba kwuru na ọ bụ “mgbe ndị otu anyi ruru n’ụlọ ebe ha dobere Sullivan ka ndị omekeome ahụ jiri ụgbọala ha gbaa ọsọ ma na-agba ndị otu anyị egbe”.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụ oge ha na-akwakọrịta mgbọ ka mmadụ atọ n’ime ndị ntọ ahụ nwụrụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *