Otu jikọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ Nigeria Bar Association (NBA) na onye ọchịchị gbatagbata na-achị Rịvas Steetị bụ Ibok-Ete Ibas na-enwe ezigbo nsogbu ugbua.
Ihe na-esere ha bụ ego nkwado Gọvanọ Sim Fubara e wepụrụ n’oche nyere ndị NBA maka ime ọgbakọ ha na Rịvas Steetị.
Esemokwu ọhụrụ a bidoro ka onye ọchịchị gbatagbata steeti ahụ bụ Ibok-Ete Ibas gwara ndị NBA ka ha wechita akatamkpo “ego ruru N300,000,000 e si n’akpa steeti ahụ nye ha” dịka akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru steeti ahụ bụ Hector Igbikiowubo ziputara si kwuo.
Mana onyeisi ndị na-ahazị ọgbakọ NBA nke afọ a bụ Ọkaiwu Emeka Obegolu kwuru na enweghị ego ọbụla ha ga-enwechị enye Rịvas steeti.
N’okwu ya “anyị adịghị eresi mmadụ ikike ị haziri anyị ọgbakọ anyị na-eme kwa afọ”.
“Ego gọọmenti Rịvas steeti nyere anyị bụ onyinye n’efu ka ọ bụ, enweghị ka o si bụrụ iwu na anyị ga-eme ọgbakọ na steetị ahụ.”
Leave a Reply