Take a fresh look at your lifestyle.

Ndịagha RSF ekwupụtala mmalite ọchịchị ọzọ na Sudan

0 120

Ndịagha nnupụisi kwuru na ha amalitela ọchịchị ga-agba gọọmentị ndịagha Sudan mgba, mgbe ọ gachara afọ abụọ amalitere agha nke kpalitere nsogbu enyemaka mmadụ kachasị n’ụwa niile.

Onye ndu Rapid Support Forces (RSF), Mohamed Hamdan “Hemedti” Dagalo, kwuru na otu ahụ na-ewu naanị ọdịnihu dị mma maka Sudan.”

Nkwupụta a na-eme dịka mba UK haziri ọgbakọ iji cheta afọ abụọ a malitere agha, ebe odeakụkwọ na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi nke UK kpọrọ oku maka ịchọta ụzọ udo.

Agha ka na-aga n’ihu dịka ndịagha kwuru na a tụrụ ogbunigwe ebe ndịagha nnupụisi RSF nọ na mpụga obodo el-Fasher nke mere ka ọtụtụ puku mmadụ gbapụ n’ebe ndị gbara ọsọ agha bi na Zamzam.

Hemedti kwuru na RSF na-ewu “ọnọdụ iwu” na ọ bụghị steeti nke ndị mmadụ na-achị n’otu n’otu.

“Anyị anaghị achọ ọchịchị, kama ịdị n’otu. Anyị kwenyere na ọ dịghị agbụrụ, mpaghara, maọbụ okpukpere chi na-ejide ikike nke ndị Sudan, “ nkwupụta ya na Telegram gụrụ.

O kwuru na gọọmentị ya ga-agba mbọ ịhụ na ha wetere agụmaakwụkwọ na ahụike na mpaghara ndị RSF na-achị na mba Sudan niile.

Ihe karịrị mmadụ narị anọ (400) anwụrụ na mwakpo ndị RSF mere n’oge adịbeghị anya dịka ụlọọrụ UN siri kwuo .

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *