Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Soludo akatọọla ntọrọ onye ome iwu n’Steeti Anambra

0 817

Aka n’achi Steeti Anambra,Ọkanmụta Chukwuma Soludo akatọọla etu ndi ntọri si tọrọ onye omeiwu n’anọchite anya Aguata Constituency II na ụlọ nzukọ omeiwu Steeti Anambra bụ, Okechukwu Okoye.

Na okwu ya site n’aka onye Chief Press Secretary,bụ Mazi Christian Aburime, ọ katọrọ etu esi tọrọ onye Campaign Direkito bụ, Mazi Cyril Chiegboka,bụ ndi ji egbe ana amaghi na mpaghara Aguata ma kwuo ka ahapu ha ozugbo ozugbo.

Gọvanọ Soludo katọrọ ọnọdu enweghi ezi nchekwa gba gburugburu steeti Anambra,ebe ana egbu ụmụafọ mana akusukwa ha,nkea n’eme mgbe gọọmenti ya na agba mbọ inweta udo na ezi nchekwa na Steeti a.

Ọ gara n’ihu kwuo na onweghi onye ọbụla nwere ikikere itọrọ mọbụ gbuo mmadu ibe,ma were ohere a kasie ndi nile ọnọdu ọjọọ a meturu obi ma kwuo na gọọmenti hana ndi ọrụ nchekwa na agba mbọ ihụ na udo lọghachiri n’Steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *