Take a fresh look at your lifestyle.

A họpụtala Sịnetọ Orji Uzor Kalu dịka onyeisioche kọmitii ụlọomeiwe sịneti na-ahụ maka South East Development Commission.

0 72

Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa ekwuputala Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-anọchiteanya Abịa Nọt dịka onyeisioche kọmịtii ụlọomeiwu sịneti na-ahụ maka South East Development Commission (SEDC).

South East Development Commission (SEDC) bụ otu n’ime ụlọọrụ na-ahụ maka mmepe mpaghara Naịjirịa dị iche iche Onyeisiala Bola Tinubu binyereaka ka ọ bụrụ iwu.

A họpụtakwara Sịnetọ Ken Eze si Ebonyi steeti dịka osote onyeisioche kọmitii ahụ, ebe onyeisi ụlọomeiwu Sịneti bụ Godswil Akpabio kwuru na ọ ga-akpọpụta aha ndị ọzọ so na kọmitii ahụ n’oge na-adịghị anya.

Nhọpụta a pụtara na Sịnetọ Kalu na ndị kọmitii ahụ ga-arụ ọrụ iji hụ na South East Development Commission mịtara mkpụrụ e ji maka ya hiwe ya nke gụnyere inweta ezi nchekwa, igbochi mbuze, iwulite nrụpụta nakwa ihe ndị ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *