Take a fresh look at your lifestyle.

Trump etinyela ụtụisi ọhụrụ na ngwaahịa ndị si mba Kanada, Meziko na Chaịna

0 94

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump etinyela ụtụisi ọhụrụ na ngwaahịa niile e si na mba atọ gụnyere Chaịna, Meziko na Kanada bụ ha na ha kachasị azụkọ ahịa.

Trump kwuru na ụtụisi ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị Tuzde, nke bụ pasentị iri abuo na ise n’isi mba Kanada na Meziko, tinyekwuru pasentị iri n’isi mba Chaịna.

O kwuru na ụtụisi ọhụrụ a ga-adị ire ma ọ bụrụ na mba atọ ndị a elebeghị anya na mkpesa ya banyere ịbata Amerịka n’ụzọ iwu na-akwadoghi nakwa ihe banyere ịtụ mgbere ọgwụike.

Mba Kanada na Meziko kwuru na ha na-akwado itinye ụtụisi n’elu ngwaahịa ndị si Amerịka abata obodo ha.

N’afọ gara aga, ngwaahịa ndị si mba ndị a mejupụtara pasentị iri ano na ngwaahịa ndị e bubatara na mba Amerịka.

Trump hụtara ntụkwasị ụtụisi a dịka ụzọ ọ ga-eji wulite akụnaụba mba Amerịka, chekwaa ọrụ ma wulite ego a na-anata n’ụtụisi si n’aka mba ndị agbataobi ha.

Ndị ọkachamaara n’akụnaụba kwuru na nke a nwereike itinye akụnaụba mba Kanada na Mexico na nsogbu nke nwereike imetụta mba azụmaahịa mbaụwa.

Onyeisiala mba Meziko bụ Claudia Sheinbaum sị na ọ gwala minister na-ahụ maka akụnaụba ka o were otu aka ahụ tinyekwa ụtụisi na ngwaahịa si Amerịka abata mba ha.

Praịm minister mba Kanada bụ Justin Trudeau azaghachịla site n’iti ụtụisi pasentị iri abuo na ise na ngwaahịa ndị si mba Amerịka abata na Kanada.

Trudeau onye kwuru n’ọnwa gara aga na ọ ga-agba arụkwaghịm, sị na Trump ekewaala mba abụọ a nwere ezi mmekọ kamgbe ọtụtụ afọ.

N’otu aka ahụ ụfọdụ ndị bi na Toronto dị na Kanada kwuru na Trump na-eleghara mmekọrịta dị n’etiti Amerịka na Kanada anya.

N’ime izuụka abụọ Trump banyere n’ọchịchị nke ugboro abụọ, ọ na-agbanwegharị atụmatụ akụnaụba mba Amerịka na mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *