Otiegwu a ma ama na Naịjirịa bụ Innocent Idibia, onye aha e ji mara ya bụ 2Baba maọbụ Tuface ekwuola na ya na nwunye ya bụ Annie Idibia ekewaala.
Di na nwunye ahụ aha ha na-ewu ewu gbara akwụkwọ n’afọ 2012 ma mụtakwa ụmụaka nwaanyị abụọ.
N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi Instagram ya, nwaamadị ahụ tipụtara ‘African Queen’ kwuru na ya na nwunye ya ekewaala ma na-akwadokwa ịgba alụkwaghịm.
Ozi ahụ sịrị “mụ na Annie Macauley ekewaala kemgbe ụfọdụ oge, mana ugbua anyị etinyela akwụkwọ maka ịgba alụkwaghịm.”
E mechara hichapụ ozi ahụ mana 2Baba wepụtara ihe onyonyoo iji kwadoo ihe ọ depụtara oge gara aga.
Tupu o wepụta ihe onyonyoo ahụ, o dere sị “E nweghị onye banyere n’ọbaozi Instagram m. A kwụ m n’ihe m kwuru na mbụ. Eji m udo wee bịa.”
Di na nwunye ahụ mere mmemme agbamaakwụkwọ dara ụda na Dubaị n’afọ 2013.
Leave a Reply