Onye nwee Mahadum Afe Babalola dị n’Ekiti Steeti bụ Aare Afe Babalola ewezugala akwụkwọ niile ọ gbara n’ụlọikpe megide onye ọkaiwu Dele Farotimi site n’arịrịọ Ooni nke Ife bụ Oba Adeyeye Ogunwusi rịọrọ ya.
Babalola kwuru nke a n’ụbọchị Sọnde, ma kwuo na Ooni nke Ife nakwa ndị ndu ọdịnala ndị ọzọ rịọrọ ya ka ọ hapụ okwu ahụ.
Cheta na Farotimi bipụtara akwụkwọ ọ kpọrọ “Naịjirịa na mpụ dị na ngalaba ụlọikpe ya”, bụ ebe o boro ebubo na Babalola metọrọ ngalaba ikpe ziri ezi.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Babalola kwuru na o nweghi ihe ọzọ ọ ga-eme na-abụghị irubr isi n’ihe ndị ndu ọdịnala nyere ma kwuo na okwu ọbụla si n’ọnụ Oba n’ala Yoruba bụ iwu.
N’okwu ya “Ajụrụ m ịnata ọdọ mmanụ agbidi ma kwuchite ọnụ EFCC ma jụkwa ọkwa mịnịsta ugboro abụọ, sị na ọ tụrụ ya n’anya etu mmadụ ga-esi teta n’ụra ma chọrọ imebi ihe ndị ọ tara ahụhụ rụọ.
“O nweghi uru m ga-erite n’ịtụ ya mkpọrọ, ana m enwe aṅụrị oge ọbụla m nyere ihe”.
Ooni nke Ife arịọbuola Babalola arịrịọ ka o lee anya n’ihu ọtụtụ mmadụ gbapụtara ihe tinyerela ọnụ n’okwu ahụ.
Leave a Reply