Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị mmadụ agbaala ọsọ dịka ndịagha nnupụisi kwuru na ha ewerela obodo

175

Ndịagha nnupụisi si n’otu M23 kwuru na ha ewerela obodo Goma dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Kongo.

Ndị bi ebe ahụ kesara ihe onyonyoo na-egosi ebe ndị otu M23 na-akpagharị n’ogbe ndị a ma ama na Goma dịka ha wakpochara ndịagha Kongo n’ụbọchị Sọnde 26 Jenụwarị 2025.

Ozi ụlọmgbasaozi dị na Kongo wepụtara kwuru na ndị mmadụ riri mbọmbọ oge ha nụchara ụda egbe na ntiwa ogbunigwe.

Ọnọdụ ahụ bịara oge Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ boro Rụwanda ebubo ịkpọ oku agha site n’iziga ndịagha ha n’okeala ha iji kwado ndịagha nnupụisi M23.

Rụwanda ekwuola na Kinshasa na-akwado ndịagha nnupụisi chọrọ ka ọchịchị gbanwee na Kigali.

Ka o sinadị, Kenya akpọọla oku ka a kwụsị nkwarịta mgbọ ma kwuo na ndị isiala mba Kongo na Rụwanda ga-aga ọgbakọ ọdụrụkụọ n’ime ụbọchị abụọ na-abịa abịa.

N’aka nke ọzọ, odeakwụkwọ otu mbaụwa bụ António Guterres agwala mba Rụwanda ka ha wezuga ndịagha ha n’okeala Kongo ma gwakwa ndịagha nnupụisi M23 ka ha kwụsị mwakpo ha na-eme.

Comments are closed.