Onyeisiala mba Tunisia bụ Kais Saied enwetela mmeria nke ugboro abụọ na ntụliaka onyeisiala e mwere na mba ahụ.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka na mba ahụ kwuru na Kais Saied jiri vootu dị pasenti iri itolu merie na ntụliaka ahụ.
Ọ bụ naanị mmadụ abụọ n’ime mmadụ iri na otu kwuru na ha chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ ka e nyere ikike ịzọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka ahụ e mere ụbọchị Sọnde abali isii nkeonwa Ọktoba.
Akụkọ kwuru na n’ime mmadụ dị nde itoolu (9 million), ọ bụ naani pasenti iri abuo na itolu n’ime ha sonyere tụọ vootu na ntụliaka ahụ.
Onye gbara nke abụọ na mpụtara ntuliaka ahụ bụ o ji ego achụ ego Ayachi Zammel, ritere naanị vootu pasenti asaa agbanyehji na a tụrụ ya nga ihe ruru afọ iri na abuo maka ebubo akwụkwọ ụgha abalị ise tupu e mee ntụliaka ahụ.
Emeghị achụmnta vootu maọbụ nrụrịtaụka ọbụla, ebe akụkọ kwuru na-akwụkwọ achụmnta vootu niile a hụrụ bụ nke na-akwado Onyeisiala Kais Saied.
Cheta na ọ bụ na mba Tunisia ka ngagharịiwe ndị okpukperechi alakụba malitere n’afọ 2010 nke butere ọchụchụ Zine El Abidine Ben Ali dịka onyeisiala mba ahụ n’afọ 2011.
Ka a họpụtara ya dịka onyeisiala n’afọ 2019, Kais Saied gbara afọ 66 machiri ntụliaka ụlọomeiwu, degharịa iwu obodo ma nye onwe ikike ọchịchị niile
Leave a Reply