Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala mba Namibia anwụọla ka ọ gbachara afọ iri asatọ na abụọ

0 409

Onyeisiala mba Namibia bụ Hage Geingob anwụọla dịka ọ na-ata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ dị n’isiobodo bụ Windhoek.

Osote onyeisiala ha bụ Nangolo Mbumba kwupụtara na Geingob nwụrụ n’isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde abali ano Febụwarị 2024.

“N’akụkụ ya bụ nwunye ya bụ Madame Monica Geingob na ụmụ ya,” dịka Maazị Mbumba si kwuo n’ozi o wepụtara.

Onyendu a gbara afọ iri asato na abuo nọbu na-arịa ọrịa kansa ma kwupụta ọrịa a n’ihu ọha n’ọnwa gara aga.

Ụlọọrụ ya kwuru na ọ ga-eme njem gaa mba Amerịka maka ọgwụgwọ, ma sị na ọ ga-alọghachị na Namibia n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị.

Nwamadị a buru ọkwa onyeisiala n’afọ 2015 ma na-achị ọchịchị nke ugboro abụọ bụ nke ikpeazụ ya.

O mere ọwụwa ahụ a kpọrọ ‘aortic operation’ n’afọ gara aga ma kwupụta na ọ gbakeela site n’ọrịa kansa nke a kpọro ‘postrate’ n’afọ 2014.

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya.

Ihe i kwesịrị ịma maka Hage Geingob

  • A mụrụ Hage Gottfried Geingob n’ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọstụ 1941
  • Geingob bụ nnukwu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Namibia banyere n’ọkwa onyeisiala n’ọnwa Maachị afọ 2015 ruo oge ọnwụ ya.
  • O jibu ọtụtụ ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị gụnyere; Praịm minista mbụ nke mba Namibia mgbe ha nweere onwe ha n’afọ 1990 ruo 2002, chịa nke ugboro abụọ site n’afọ 2012 ruo 2015
  • Ọchịchị ya nyere aka n’ịhazi nakwa ịtụziaka n’ukporo mba ahụ ga-adị.
  • Ọ banyere n’ọchịchị Onyeisiala n’afọ 2015 ma nọrọ ebe ruo oge ọnwa ya dịka ọ na-achị nke ugboro abụọ.
  • Ọchịchị ya gbadoro ụkwụ na mwulite akụnaụba, ọdịmma ndị obodo nakwa mmekọrịta Namibia na mba ndị ọzọ.

Mba Namibia na-akwado ime ntuliaka onyeisiala na ndị omeiwu n’ọnwa Nọvemba afọ a.

Otu ndọrọ ndọrọ nọ n’ọchịchị bụ Swapo kamgbe ha nweere onwe ha n’afọ 1990 họpụtara Nwada Nandi-Ndaitwah dịka onye ga-eji aha ha azọ ọkwa onyeisiala.

Ugbua o ji ọkwa dịka osote praịm minista mba Namibia, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ ga-achị mba Namibia ma ọ bụrụ na o merie.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *