Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwela nkwa ịhụ na gọọmenti rụụrụ ndị Naịjirịa ọrụ ma weta ezi ọganihu nye ụmụafọ Naịjirịa ọbụla.
Onyeisiala Tinubu kwuru nke a na nnukwu ọgbakọ pati ya bụ All Progressives Congress mere n’ogige Eagle Square dị n’Abuja n’ụbọchị Fraịde 27 Maachị, 2026.
O ji ohere ọgbakọ ahụ kpọọ oku ka ndị otu APC jikọọ aka ọnu ma kwalite ebumnobi ‘Renewed Hope Agenda’ ha iji hụ maka ọdị mma Naịjirịa.
N’okwu ya “Ọchịchị m maara na ọtụtụ ihe adịghị etu o kwesiri ugbua, mana aga m agba mbọ hụ na ntụkwasiobi ụmụafọ Naịjirịa nwere na pati anyị nakwa gọọmenti anyị, abụghị ihe efu”.
Onyeisiala Tinubu gara n’ihu rụtụsịa aka n’ihe ụfọdụ nakwa ọtụtụ mbọ ọchịchị ya na-agba ime ka Naịjirịa bụrụ mba e ji ama atụ.
Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na ọtụtụ mbọ gọọmenti ya na-agba na-amịta mkpụrụ maka ezi nkwado na ntụkwasị obi ndị Naịjirịa nwere na pati APC
O kwuru na gọọmenti ya nakwa pati ya kwụrụ chịm ibu agha megide ụfọdụ nsogbu na-echere Naịjirịa aka Dịka enweghị ọkụ latrik, enweghị ezi nchekwa nakwa ndị ọzọ dika ibe ya.
Ọ kwukwara na pati APC enweghị atụmatụ imachi pati ndị ọzọ ma kwuo na APC bụ pati nwere ezi nkwenye n’ọchịchị onyekwuouche ya.
Leave a Reply