Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe anyị ma maka mwakpo e mere na Plateau steeti dịka gọọmenti tinyere mmachi abalị abụọ

0 66

Gọọmenti Plateau steeti entinyela mmachi abalị abụọ na mpaghara ọchịchị ime obodo Jos north dịka e mere mwakpo ọjọọ n’ụbọchị Sọnde abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Maachị 2026 ma gbuo ọtụtụ mmadụ, ebe ụfọdụ merụrụ ahụ n’obodo Gari Ya Waye dị na Anguwan Rukuba.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Joyce Lohya Ramnap sị na gọọmenti katọrọ mwakpo ahụ.

O kwuru na mmachi gọọmenti tinyere malitere n’ime abalị Sọnde ma gaa n’ihu ruo n’abalị mbụ nke ọnwa Eprel.

Ramnap kọwara na mmachi a bụ iji gbochie mmebi iwu ọzọ ebe ndị ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ ịchọta ndị aka ha dị na mkpa mkpa ahụ.

Aka na-achi Plateau Steeti bụ Caleb Mutfwang nyere ndị bi ebe ahụ obisiike na e zigaala ndị nchekwa iji chekwaa ndụ ndị mmadụ na ihe onwunwe ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *