Otu jikọrọ ndị nkụzị mahadum na Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) enyela gọọmenti etiti Naịjirịa abalị anọ ka jiri mezuo nkwekọrịta ụgwọ ọnwa ọhụrụ ndị otu ha na Naịjirịa niile gbaa gburugburu.
Onyeisi ASUU bụ Ọkammụta Christopher Piwuna kwuru nke a n’ụbọchị Tọzde 26 Maachị, 2026na mmemme e mere na mahadum Sa’adu Zungur University, Yuli, Bauchi steeti.
Ọkammụta Piwuna kwuru na ha na gọọmenti etiti nwere nkwekọrịta ụgwọ ọnwa ọhụrụ ahụ na Dismeba 2025 ma kwuo na gọọmenti kwesiri ịmalite ịkwụ ha ụgwọ ahụ n’ọnwa Jenụwarị, 2026.
O kwuru na abalị anọ ahụ ya nyere gọọmenti malitere n’ụbọchị Tọzde 26 Maachị, 2026. Ọ kọwara na ọ bụrụ na gọọmenti ghara ịmalite ịkwụ ha ụgwọ ọnwa ọhụrụ n’ime abalị anọ ahụ ha nyere, ha ga-azaghachi gọọmenti n’ụzọ ha atụghị anya.
Ọ gara n’ihu katọọ etu gọọmenti ji ghara imezu ihe dị n’ọtụtụ nkwekọrịta ha abụọ nwere n’oge gara aga nke mere ka ndị out ASUU gbaa abụbọọrụ ugboro ugboro.
Leave a Reply