Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Etiti ekwupụtala ezumike ọha n’ụbọchị Tọzde na Fraịde maka emume ‘Eid-el-Fitr’

0 196

Gọọmenti Etiti Naịjirịa ekwupụtala ụbọchị Tọzde, 19 Maachị na Fraịde, 20 Maachị, 2026, dịka ụbọchị ezumike ọha iji mee emume ‘Eid-el-Fitr,’ nke na-egosi njedebe nke ọnwa nsọ nke ‘Ramadan’.

E kwupụtara nke a n’akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ nke Mịnịstrị nke ime obodo bụ Magdalene Ajani, binyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde.

Dịka o si kwuo, Minista nke ime obodo bụ Olubunmi Tunji-Ojo, onye kwupụtara nke ahụ n’aha gọọmenti etiti, kelere ndị Alakụba maka mmezu nke ọnwa nsọ nke ‘Ramadan’ nke ọma.

Minista ahụ gwara ndị Alakụba ka ha nọgide na-enwe agwa ọma nke ịhụnanya, mmesapụ aka, udo, ndidi, na ịchụ aja nke a na-akpọ mkpa n’ọnwa nsọ.

Ọ kpọkwara ndị Naịjirịa niile ka ha jiri oge emume ahụ kpee ekpere maka udo, ịdị n’otu, na ọganihu nke mba ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *