Take a fresh look at your lifestyle.

Minista maka Ozi na Omenala akwadola igwebuike n’ọrụ.

Chigo deziri ya n' Igbo

0 138

Mohammed Idris,   Minista maka Ozi na Omenala akwadola ndị ndu na ndị ọrụ na-ahụ maka ozi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi gọọmenti ka ha kwalite àgwà nduzi, imekọ ihe ọnụ, na ịnwe mmetụta iru ọrụ n’ọrụ ha.

Dị ka o si kwuo,  mgbasa ozi ọha na-adabere n’otú ndị isi si edu ndị ọrụ ha ma na-arụkọ ọrụ ọnụ. O gosiri na mgbe nduzi esonyeghi, usoro mgbasa ozi dum na-adaba n’ọgba aghara.

Ọ gwara ha ka ha zere esemokwu na asọmpi n’etiti ụlọ ọrụ ha, n’ihi na nke a na-ebelata ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na ozi gọọmenti. Kama nke ahụ, o kwuru na imekọ ihe ọnụ ga-enyere ka e wee na-ewepụta mmemme na atumatu gọọmenti n’otu olu, n’ụzọ doro anya na nke ọkachamara.

Minista ahụ mesikwara ha obi ike na Gọọmenti Etiti ga na-eme nzukọ na mkparịta ụka ugboro ugboro, iji gee ndị ọrụ mgbasa ozi ntị ma mata ihe ịma aka ha na-eche ihu n’ọrụ ha kwa ụbọchị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *