Take a fresh look at your lifestyle.

Onye bụbu Gọvanọ steeti Enugu kwadoro Onye Isi Ala Naijiria  Bola Ahmed Tinubu.

Chigo dere ya n'Igbo

0 850

Maazị Sullivan Chime,Onye bụbu Gọvanọ steeti Enugu akwadoro Onye Isi Ala Naijiria  Bola Ahmed Tinubu maka ¡banye oge nke abụọ n’ọfịs, na-akọwa ọrụ Onye Isi Ala ahụ dị ka nke a ga-atụ anya ma too ya.

Nwamadi a sịrị na ọ naghị enwe obi abụọ ọ bụla na Tinubu na APC ga-emeri ntuli aka kpamkpam na South East n’afọ 2027.

N’ Udi, ka o kwuru okwu a n’oge mmalite ndebanye aha eletrọnik (e-registration) nke APC na Mpaghara Enugu  na Tuzdee. O kwuru na ndị ole na ole na-emegide mkpebi a n’ógbè ahụ ga-ahụ eziokwu n’anya n’oge na-adịghị anya ma nabata ya.

“Nke a bụ mkpebi anyị, anyị niile kwadoro ya. Ọ dị mfe imezu ya.

“Onye Isi Ala emeela nke ọma. Ekwenyere m na o meela nke ọma. Ihe ọ bụla na-eme na Naijiria bụ ihe zuru ụwa ọnụ, karịsịa n’Afrika. Ọ na-eme ebe niile. N’agbanyeghị ọnọdụ siri ike dị ugbu a, ọ ka na-eme nke ọma,” ka o kwuru.

Onye bụbu gọvanọ ahụ sịrị na ọ ga-ekwukwa nke ọma gbasara ntuli aka 2027 n’ọnwa ndị na-abịa.

“ O kwuru na mkpebi ya ịhapụ otu Peoples Democratic Party (PDP) mgbe ntuli aka 2015 gasịrị egosila ugbu a na ọ bụ mkpebi ziri ezi.

O kwuru na ndị isi APC na steeti Enugu ji obi siri ike chọọ ịgafe akara nde mmadụ abụọ e nyere ha dị ka ebumnuche n’ime mmemme ndebanye aha eletrọnik nke otu na-aga n’ihu, nke gọvanọ na onye ndu otu APC na steeti ahụ, Dọkịta Peter Mbah, tọrọ ntọala.

“Anyị bịara ebe a, nke mbụ, iji kele ndị mmadụ anyị. Ị hụla otú ndị mmadụ si nwee ọṅụ ịbanye n’APC. APC abụrụla ugbu a otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị kacha dị irè na steeti Enugu,” ka o kwusiri ike.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *