Opekatampe ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla dịka kreen aka na arụ dara n’elu ụgbọoloko na-eme njem na mba Taịland.
Dịka ndị ọrụ gọọmentị si kwuo, ụgbọoloko ahụ bu ndị njem ruru 195 si Bangkọk na-eme njem aga Taịland oge ajọ ọdachi ahụ dakwasịrị ha.
Akụkọ kwuru na mmadụ 80 ndị ọzọ gụnyere otu nwatakịrị dị naanị otu afọ merụrụ ahụ n’ihe mberede ahụ.
Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọoloko, enyeela iwu ka a malite nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdachị a.
Leave a Reply