Ahmadu Musa Kida onye isi oche ọhụrụ nke Nigeria National Petroleum Corporation Limited NNPCL, a họpụtara arịọla ndị Naijiria ka ha nye ndị ụlọ ọrụ oge iji megharịa ngalaba mmanụ .
Kida kwere ndị Nigeria a nkwa na ụlọ ọrụ a dị njikere imeghari mmanụ,gbakwụnyekwa na ndị otu ya ga-eme ihe niile ga-ekwe omume iji mezuo iwu onye isi ala nyere n’ọrụ mmepụta, ụlọ nrụpụta, na-adọta Foreign Direct Investment .
Onye isi oche NNPCL rịọkwara ndị Naijiria maka ndidi na nghọta, na-akọwa ọrụ ahu bụ”nnukwu ọrụ”
“Ọrụ anyị buru ibu, mana anyị na-asọpụrụ nke ukwuu iso n’ime mmadụ ole na ole ahọpụtara, nke Onye isi ala kpọrọ oku ka ha gbanwee ngalaba mmanụ.
“Otu ihe anyị ga-emesi ike na anyị ga na-agwa ndị Naijiria eziokwu mgbe niile, n’agbanyeghị etu ọ ga-esi dị ilu.”
Kida gara n’ihu mesie ndị Naijiria obi ike na ha na-akwado ụkpụrụ nduzi, obi ike, na iguzosi ike n’ezi ihe n’imezu ntuziaka Onye isi ala.
Ọ gbakwụnyere na a ga-elekwasị anya na bọọdụ ọhụrụ ahụ n’ịgbanwe akụkọ mgbe ọ na-anọchite anya mmasị ndị Naijiria nkịtị.
Leave a Reply