Take a fresh look at your lifestyle.

EFCC ekwuola ihe mere ha ji nwụchie Very Dark Man

0 71

Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwupụtala na ọ bụ ha nwụchiri nwaokorobịa olu ya na-ada ụda bụ Martins Vincent Otse e ji Verydarkblackman (VDM) mara.

EFCC mere ka ndi ntaakuko mata maka nnwụchi VDM n’ụbọchị Mọnde abali ise nke onwa Mee  afo 2025.

Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ EFCC bụ Dele Oyewale kwuru na ha nwụchiri nwaamadị ahụ dabere n’ọtụtụ mkpesa ndị na-ewesara VDM iwe nyere n’ụlọọrụ ha.

Oyewale kwuru sị “anyị nwụchiri VDM ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ọtụtụ ebubo ụfọdụ mmadụ boro ya.”

Oge a jụrụ ya ma aka ụlọakụ Guarantee Trust Bank (GTB) ọ dị na mkpesa ahụ, Oyewale sịrị na ha dị ọtụtụ mmadụ nyere ya bụ mkpesa ma kwuo na ọ gaghị akpọ aha ha iji chekwaa ha.

Ọ gbakwunyere na ha ga-atọhapụ ya ọ bụrụ ma o mezuo ọnọdụ beelụ ya ma kwuo na a ga-ebuga okwu ahụ ụlọikpe na-egbughị oge.

O mekwara ka o doo anya na ọ bụ n’Abuja ka ha nọọrọ nwụchie nwaokorobịa ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *