Take a fresh look at your lifestyle.

Na Steeti Niger Otu ndị ọrụ ahụike , agwala gọọmentị steeti ka ha welie ụgwọ ọnwa ndị otu ha

chigo deziri ya n'Igbo

0 31

Otu ndị ọrụ ahụike  nke Naijiria, MHWUN, na Niger steeti agwala gọọmentị steeti ka ha welie ụgwọ ọnwa ndị otu ha n’ihi oke egwu dị n’ọrụ ha.

Usman Abubakar-Dabban Onyeisi otu a na steeti ahụ rịọrọ arịrịọ a n’oge nnabata ahaziri ndị ọrụ iji mee emume ụbọchị ndị ọrụ mba ụwa na Minna n’ụbọchị Tọzdee.

O kwuru na ebe ọ bụ na ndị ọrụ ahụike bụ ndị isi sekpu nti, ọ dị mkpa ka a na-abawanye ụgwọ ọrụ ha.

Dị ka Abubakar-Dabban si kwuo, mmụba nke 150 pasent ga-akwado ọrụ dị oke mkpa ndị ọrụ ahụike na-arụ na usoro nlekọta ahụike.

O toro gọvanọ na osote aka na-achị, Yakubu Garba maka itinye n’ọrụ ọhụrụ ụgwọ ọnwa opekempe bụ N80,000, nke karịrị nke gọọmentị etiti tụrụ aro ya.

Yusuf kwuru na ụbọchị ndị ọrụ bụ ụbọchị ndị isi ọrụ ga-enyocha ihe ha rụpụtara, gbakọọ aka na ha, ma chọpụta ihe ịma aka ọhụrụ ka ha wee nwee ike imepe isiakwụkwọ ọhụrụ maka ụzọ ha ga-esi gbanarị ha.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *