Maazi Paul Chukwuma onye na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti Anambra n’otu pati YPP nke ndọrọndọrọ ochichi ga-abia n’abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2025 etoola ndị ọrụ steeti ahụ ọrụ ma na-ekwusi ike na ọ dị mkpa ka e ha nweta nkwalite ụgwọ ọrụ.
Na emume ụbọchị ndị ọrụ 2025 na steeti Anambra, Chukwuma na ha soon a ndi na-eri ugwo pere mpe na Naịjirịa.
Chukwuma kwere nkwa na ọ ga-ebute ọdịmma ndị ọrụ ụzọ na idozi esemokwu ọ bụla pụtara ìhè nke a na-eleghara anya.
Ọzọkwa, Chukwuma katọrọ na enweghị ezigbo atụmatụ ụlọ maka ndị ọrụ steeti Anambra, kọwara ya dị ka ihe ihere. O kwuru na ọtụtụ ndị ọrụ gọọmentị na Anambra enweghị ike ị nweta ụlọ ma kwusie ike na enweghị nkwado site na usoro ịgbazinye ego.
Chukwuma kwuputara na gọọmentị lekwasịrị anya n’ịrụ ụlọ gọọmentị ọhụrụ kama ibute atụmatụ ụlọ maka ndị ọrụ ụzọ, na-egosi enweghị nchebara echiche maka ọdịmma ha.
O kwusiri ike na ọ dị mkpa ka ndị ọrụ nwere ahụike na ebe obibi.
Leave a Reply