Ụlọikpe dị na Legọs steeti atụkpuola Stephen Ejezie dị afọ iri abụọ na asaa (27) n’ụlọmkpọrọ n’ihi ebubo isere onyonyoo ndị ọrụ ibe ya oge ha gba ọtọ.
Ejezie bụ onye ọrụ n’ụlọakụ Access Bank Contact Centre dị na mpaghara Oniru nke Legọs steeti.
Ndị uweojii Legọs steeti kpụpụrụ nwaamadị ahụ n’ụlọikpe n’ụbọchị Mọnde ma boo ya ebubo abụọ maka igbochi udo ọhanaeze site n’ise ndị ọrụ ibe ya onyonyoo oge ha na-asa ahụ tinyekwara ịlụso ndị ọrụ ibe ya ọgụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara ndi ntaakụkọ na akụkọ ahụ mere eme ma kwuo na ha nwụchiri Ejezie izuụka gara aga, mechaa tọhapụ ya na beelụ iji mechaa nnyocha ha.
Ọ kọwara na nwaamadị ahụ a na-enyo enyo lọghachiri n’ụlọọrụ ndị uweojii n’ụbọchị Mọnde dịka ha kpụpụrụ ya ụlọikpe.
N’akwụkwọ ikpe e mere ka o rute ndi ntaakụkọ aka, ụlọikpe ahụ nyere Ejezie ntọhapụ beelụ n’ọnụego narị puku naịra ise (500,000) tinyere ndị akaebe abụọ.
Ụlọikpe kwuru na ọ ga-anọgide n’ụlọmkpọrọ dị n’Ikoyi ruo oge o mezuru ọnọdụ niile e nyere ya na beelụ ahụ.
Ụlọikpe tinyeziri ikpe ahụ n’abali iri na itolu nke onwa Mee 2025 maka ilebara ya anya.
Leave a Reply