Na nsonso a, ama Ositaosili n’Uke dị n’Anambara steeti kpọtụrụ akpọtụ dịka ụmụafọ obodo ahụ n’ọha na n’ụzọ lọtara maka emume Uzoiyi.
Ụzọiyi bụ mmemme omenala ndị Uke na-eme kwa afọ tupu mmalite oge ọkụkọ ubi.
Iji merụba emume Uzoiyi, Ụmụafọ Uke jii nri na mmanya kwọọa ndị ọbịa ha,ma jiri ọjị gọọ ọfọ ndụ ma kpee ekpere ọganihu ihe ha ga-akọnye n’ala.
Nkọwa foto, Mmanwú dí iche iche gbara n’ emume Uzoiyi n’Uke,Anambara Steeti
Mmọnwụ dí iche iche díka Enyi Nnụnụ, Ọzọdímgba, Ijele wdgz gbara n’ọgbọ na mmemme ahụ.
Dịka otu okenye Uke bụ Bon Onwubualili si gwa BBC Igbo, ‘ Uzoiyi nke pụtara ụzọ e si aga iyi bụ emume na-adanye n’ụka Afọ mbụ n’ọnwa Eprelu kwa afọ.
“N’obodo Uke,anyị nwere Mmiri Idezuna na Obiaja. Mmiri abụọ a nwere alụsị. Ya mere tupu mmalite Udummiri, a na-asụ ọhịa toro n’ụzọ mmiri a. Ọ bụ ma a sụchaa ọhịa gara ụzọ mmiri ndị a ka emume a na-eme abalị atọ na-amalịte.”
Ọ gara n’ihu kọwaa na mmemme ahụ na-amalite Fraide ụbochị Eke ma bie n’Ụbọchịụka Afọ.
Nkọwa foto, Enyi Nnunụ so na mmanwụ gbara n’emume Uzọiyi n’Uke
Leave a Reply