Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Donald Trump tinyere na mbubata si mba dị iche iche abata Amerịka, ga-enwe n’akụnaụba Chaịna agbanyeghị uto 5.4% mba ahụ nwere na nkeji mbụ nke afọ.
Ọnụọgụgụ ahụ meriri atụmanya mmadụ mana ọnụọgụgụ a kpuchiri oge tupu mba Amerịka tinye ụtụisi ọhụrụ na ngwaahịa ndị Chaịna si na 10% gbagoro na 145%.
Onye ntaakụkọ kwuru na uto nwereike ịbụ maka etu ụlọ mepụta ihe di iche iche siri gbaa mbọ ibupụ ọtụtụ ihe tupu tarifu ọhụru ọchịchị Onyeisiala Trump amalite.
Cheta na Chaịna etinyela ụtụisi mmegwara 125% na ngwaahịa ọbụla si Amerịka abata Chaịna.
N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Chaịna Xi Jinping nọ na Malaysia, dịka ọ na-eme njem nleta na mba dị na ndịda ọwụwa anyanwụ Eshịa iji kwalite mmekọ azụmahịa Chaịna na mba ndị ahụ.
Ọzọ, Onyeisiala Trump kwupụtara ụbọchị iri itoolu (90) na tarifụ ọhụrụ ahụ dị elu na mba niile – ewezuga Chaịna.
N’ozi ọhụrụ Onyeisi mgbasa ozi n’obi ọchịchị ‘White House’ Karoline Leavitt wepụtara, Onyeisiala Trump kwuru na ọ dị n’aka mba Chaịna ịbịakwute Amerịka ka ha abụọ mkparịtịụka banyere mmekọ azụmaahịa.
Leave a Reply